Psalms 88

Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra.

Akwa maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,
nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
2Ka ekpere m bịa nʼihu gị.
Chee ntị gị nụrụ akwa m.

3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,
anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.
4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.
Adị m dịka onye na-enweghị ike.
5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,
dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,
ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,
ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.

6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,
olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela
8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.

O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?
Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela
11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?
A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?
Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?

13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.
Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?
Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?

15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;
ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;
ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;
ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;
ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.
Copyright information for IboBIU